Usoro Mgbaso ime njem/Atụmatụ/Ụzọ a ga-esi kwalite ǹkà nke anyị amaara n'ụwa niile gbaa gburugburu
You can read this page in your own language on the Movement Strategy Forum. |
Ụzọ A Ga-esi kwalite ǹkà nke anyị amaara N'ụwa niile Gbaa baa Gburugburu
Iji nwee ike Itinye ego n'ikwalite ǹkà na ịbụ ndị Ndú, anyị ga-atụpụtarịrị ụkpụrụ dị n'usoro n'usoro nke a ga-agbaso iji kwalite ǹkà. Ụkpụrụ Mgbaso a ga-amalite site na ịchọpụtagasị mkpa dị iche iche nke òtù Wikimedia na ndị nsonyere ha niile nwere n'ihe gbasara ịkwalite ǹkà. Nchọpụta mkpa a ekepụta ụkpụrụ nke ga-ehiwe isi na ihe ndị a achikọtara ọnụ: 1. Ịkwalite ǹkà nke anyị nwere ebea 2. Ichịkọta ma hazie ihe niile a ga-eme gbasara ịkwalite ǹkà n'ụwa gbaa gburugburu
Otú úrù dị na ịkwalite ǹkà nke anyị nwere ebea bụ na ọ ga eme ka eguzowe emume ndị ga-emetụta ndị mmadụ kpọmkwem n'òtù anyị dị iche iche ebea. Ichịkọta emume ndị a n'ụwa gbaa gburugburu ga-eme ka mmụta dịrị, kwalitekwa mmeso anyị na-emeso ihe ọbụla gbasara ịkwalite ǹkà ruo n'akụkụ Wikimedia Movement niile gbaa gburugburu. Ụkpụrụ a kwesịrị inwe ụzọ ndị bụ ọ̀gbọ́ maọbu ndị bụ enyi ikparịkọta ụka, itụpụtarịkọta árò, nakwa ịbụ ndị Ndú n'etiti onwe ha nke ga-eme ndị òtù Wikimedia Movement ga-amụta itokọta ọnụ dịka ótù ndị.
Kepụta ụzọ dị n'usoro n'usoro zuru ụwa ọnụ nke a ga-agbaso ịkwalite ǹkà maka òtù anyị ha ndị anyị nwere ebea, ndị nọ n'ime òtù ndịa, nakwa ọgbakọ ha niile. Nke a gụnyere na anyị ga:_
- Guzobe ụzọ maọbu usoro ime ihe nke ga-egosipụta n'ụzọ doro anya ihe ndị enweenwe, na ihe ndị bụ mkpa ma mepụta ụmụ kịrịkịrị ozi eji arụ ọrụ nke ga-enye aka itinye atụmatụ nkwalite ǹkà ndị ahụ n'ọrụ, elekwasị anya na mkpa ndị dị n'eziokwu.
- Guzobe emume ndị n'akwalite nzukọ maọbu njikọ ndị bụ ọ̀gbọ́ maọbu ndị bụ enyi gafee akụkụ òtù a niile maka nkụzi na mmụta ǹkà (ọmụmaatụ mmekọrịta ndị bụ ọ̀gbọ́ maọbu ndị bụ enyi maka ọmụmụ ihe, nakwa ikpokọta ọnụ maọbu ịnatacha ozi dị iche iche site n'aka ndị sonyere òtù a na ndị ha na òtù a n'enwe mmekọ n'ụdị ọbụla)
- Ịkwalite ụzọ esi eme ihe dị iche iche, nke gụnyere ọzụzụ, inye nduzi, inye ndụmọdụ,ịmụ ihe site n'ikuku ịntanetị, enyemaka maọbu nkwado ọ̀gbọ́-nye-ọ̀gbó, nakwa emume ha gasị.
- Kepụta ihe nrite ga-adọta ndị mmadụ iji kwadoo nkwalite ǹkà (n'ikuku nakwa n'ìfè) site n'ihụchata ǹkà di iche iche (ọmụmaatụ site ákàra dị iche iche meghere emeghe)
Participate
Discuss
Join or start a discussion on Meta or the "Tinye ego na úchú n'ikwalite ǹkà na ịbụ ndị Ndú" space of the Movement Strategy Forum.
Create
Apply for a Movement Strategy implementation grant to create a project that advances this initiative.
Get help
If you need help in getting involved, please don't hesitate to get in touch directly with members of the Movement Strategy and Governance Team. They are here to help!
You can write to the team in any of 19 languages (listed on the team's page), by writing an email to: strategy2030wikimediaorg
Mkparịtaụkaga na ihe ndị edere ede ndị gbasara ya
Ụfọdụ n'ime mkparịtaụkaga ndị gáfèrè agafe na ihe ndị edere ede na usoro Mgbaso Movement Strategy Recommendations ndị nwere ike ịkọwakwu atụmatụ a ọfụma:
- Usoro Mgbaso Ịwulite ngabasị #0: Ụkpụrụ Mgbaso niile nke Ịwulite ngabasị
- Usoro Mgbaso Ịwulite ngabasị #1: Ịwulite ngabasị maka mwulite ngabasị
- Usoro Mgbaso Ịwulite ngabasị #3: Ịwulite ngabasị kwesịrị ka eme ya n'àgbà n'àgbà
- Usoro Mgbaso Ịwulite ngabasị #4: Rọpụta ịwụlite ngabasị maka mwulite nke ndị òtù
- Usoro Mgbaso Ịwulite ngabasị #5: Akụnaụba dị iche iche maka Ịwulite ngabasị
- Usoro Mgbaso Ịwulite Ahụike nke obodo #5: Itinye ego na úchú n'iwuputa òtù ndị mmadụ siri ike nt'ihe a na-eme ndị ámàkwa àmá n'ụwa niile
- Usoro Mgbaso maka Njikọaka ha #10: Kwadoo nkwalite ǹkà maka ndị n'arụ ọrụ n'ime ka njikọakaga na abawanye
- Usoro Mgbaso ịkesa akụnụba #G: Kesaa akụnụba òtù o kwesịrị maka Ịwulite ngabasị na ịdịgide adịgide
- Usoro Mgbaso ikesasị ọrụ na ihe ekwesiri ka emegasịa #7: Ịwulite ngabasị
- Community Capacity Development (2015)
- Community Capacity Map (2018)
- Ịrụsi ọrụ ike nke òtù: Ịwulite ngabasị maka kọmitii dị iche iche (2015)
- Partnerships & Resource Development (2015)
- Akụnụba ha ndị gbasara mgbasa ozi: Ịwulite ngabasị (2015)
- Wikimedia Conference Capacity Building Track Documentation (2017)
- Gịnị bụ Ịwulite ngabasị? (2018)