Movement Charter/Nkọwa okwu

This page is a translated version of the page Movement Charter/Glossary and the translation is 100% complete.


Ọrụ Nlekọta

"Ọrụ nlekọta" na-ahazi ma n'akọwa mmekọrịta dị n'etiti ndị Otu Ọgbakọ na ngalaba otu gasị ebe ha na-eje ozi. Nke a gụnyere, ma obeghi na: inye ohere nsonye na nnabata odiiche na gburugburu ebe ọrụ nye ndị otu ngalaba; na-akwado ihe omume na ọrụ Wikimedia n'intanentị; na-arụ ọrụ iji nwetakwuo ihe ọmụma n'efu site na ntinye aka ndị ngalaba otu dị otu a; na, na-eje ozi dị ka onye nnochite anya n'etiti ndị ngalaba otu dị otu a na ọha na eze n'ozuzu.

Ngalaba otu

Otu ndị mmadụ na-arụsi ọrụ ike na ọrụ Wikimedia ma ọ bụ na-akwado ha n'ọtụtụ ụzọ (na nwepụta onwe ịrụ ọrụ, nhazi ihe omume,nchịkọba wdg). A na-akpọkarị ndị a ndị Wikimedia.

Ọdịnaya

Ihe ọ bụla agbakwunyere, ewepụrụ, gbanwee, dezigharịa, dezie, hichapụ, ma ọ bụ gbanwee site n'aka onye ọrụ debanyere aha ma ọ bụ onye na-edebaghị aha ya site na iji ihu onye ọrụ ọ bụla nke na-ebute mgbanwe na akụkụ ọ bụla nke ọrụ Wikimedia.

Ịha nha anya

Ịha nhatanha bụ mgbalị iji hụ na a na-ahụta ntunye dị iche iche nke otu ọ bụla ma jiri ya kpọrọ ihe. Nke a na-agụnye ịnakwere ọnọdụ na ihe mgbochi ndị na-emetụta ikike nke ndị otu niile gbochiri ha inwe otu ụdị ihe ịga nke ọma. A naghị eme ya site n'imeso onye ọ bụla n'otu ụzọ ahụ.

Ihe Ọmụma n'efu

ihe Ọmụma n'efu, ihe ọmụma ekpuchighi ekpuchi, ma ihe ọmụma n'efu na nke ekpuchighị ekpuchi bụ ihe bụ n'efu ka a na-enyefe ya ma enwere ikike iji ihe ọmụma efu mee ihe , jigharịa ya mee ihe, ma kesaa ya n'enweghị mgbochi n'ihi ego, nke ọha mmadụ ma ọ bụ teknụzụ.

Ịchụnta ego

Ịchụnta ego bụ omume nke ịchọ na inweta onyinye. N'ime Charter a, a na-eji okwu ahụ bụ "Ịchụnta ego" akọwa usoro nke ịchọ onyinye ego site n'aka ndị otu onwe ha na ndị na-enye onyinye n'onwe ha n'otu n'otu. Okwu a gụnyere onyinye ndị ọzọ nyere, na mgbe na mgbe iji kwado ebumnuche ụfọdụ.

Maka ụzọ ndị ọzọ e si enweta ego, lee usoro nnweta ego.

Nsonye

Omume nke ibelata nchụpụ na ịkpa ókè (gụnyere ma ọ bụghị nanị na afọ, ọkwá mmekọrịta mmadụ na ibe ya, agbụrụ, okpukpe, okike, mmasị mmekọahụ) site n'aka ndị mmadụ n'otu n'otu na otu site na ịgbanwe ntọala, iwu, na usoro iji mepụta ọnọdụ maka mpụta nke ịdị iche iche.

Usoro nnweta ego

Nnweta ego bụ usoro nke inweta ego ọrụ iji kwado otu akụkụ ma ọ bụ karịa nke ọrụ Otu a. Ụfọdụ imaatụ nke nnweta ego bụ:

  • Ịchụnta ego
    • tinyere onyinye ego ọrụ ndị ọzọ nyere (anaghị egbochi egbochi ma ọ bụ iji kwado ebumnobi akọwapụtara), nnukwu onyinye, ma ọ bụ mmemme ịchụnta ego,
  • ụgwọ otu maka ndị mmekọ

Ihe metụtara nnweta ego bụ "onyinye n'ụdị," mgbe otu ma ọ bụ onye ọ bụla na-etinye aka n'ọrụ na/ma ọ bụ ihe anya n'ahụ na-anaghị ego, ma ọ bụ site na ibelata ego kwesiri. Ọmụmaatụ nwere ike ịgụnye:

  • ụlo nzụkọ ma ọ bụ oghere ọfis
  • ohere ịntanetị; na
  • inweta ohere n'efu iji nweta ihe ndị echekwara.


Ihe onwunwe

Ihe onwunwe bụ ngwaahịa ma ọ bụ nnyefe nke ego, ihe, ndị ọrụ, ihe ọmụma na ihe abamuru ndị ọzọ mmadụ ma ọ bụ ụlọ ọrụ nwere ike ịnweta iji rụọ ọrụ nke ọma.

N'ihe gbasara Njem Wikimedia, ihe onwunwe gụnyere:

  • akụ ego enwetara site n'nnweta ego;
  • ndị mmadụ (tinyere oge ha, mbọ ha, na ikike ha; ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ọrụ afọ ofufo na-agba mbọ na uto njem a; na, ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị ọrụ a na-akwụ ụgwọ na-akwado ndị ọrụ afọ ofufo),
  • aha òtù Wikimedia na ọrụ ya na ihe omume ya dị ka isi iyi nke ihe ọmụma e mere ka ụwa nwee ohere nweta n'efu;
  • ọdịnaya nke ọrụ Wikimedia dị ka ndị ọrụ afọ ofufo mepụtara ma jikwaa ya;
  • nchekwa anya n'ahụ nke nwere ngwanrọ na ọdịnaya nke ọrụ Wikimedia; na
  • odide akwụkwọ mmụta na ihe ọmụma iji kwado ọrụ a na ọrụ na ihe omume nkeOtu a ndị ọzọ.


Ndị ntinye aka

Onye ọ bụla ma ọ bụ otu ọ bụla, ma ọ bụ onye ọrụ afọ ofufo ma ọ bụ na ọ bụghị, n'emeela ntunye mmefu n'udi mmadụ, ego ma ọ bụ ihe metụtara ego na otu, nke nwere ike imetụta mmezu nke ebumnuche Otu ma ọ bụ nwee mmetụta site na mmezu nke ebumnuche ndị ahụ.

N'ime Akwụkwọ a, "ndị na-enye aka" bụ ndị mmadụ ma ọ bụ otu ndị nwere oke n'imezu ebumnobi nke otu ahụ. ido anya, okwu a na-agụnye ngalaba ndị dị n'ịntanetị na ndị na-anọghị n'ịntanetị, otu ahaziri ahazi dị ka ndị mmekọ, Wikimedia Foundation, na ndị otu sitere na gburugburu ebe nkesa ozi ịntanetị, dị ka ndị njikọ na ndị mmekọ.

Inyeaka

Nkwado bụ ụkpụrụ n'akọwa n'ekwesịrị ime mkpebi n'ogo kachasị ala enwere ike, yana ndị ọzọ metụtara nọ na ọkwa dị elu na-abata naanị mgbe ọ dị mkpa. [1]

Njem Wikimedia

“Wikimedia Movement” bụ nkọwa nchịkọba ndị mmadụ, otu, na otu ndị na-akwado ma sonye webụsaịtị na ọrụ Wikimedia. Ọ gụnyere ndị niile na-arụ ọrụ metụtara atumatu iwu, ụkpụrụ, na ụzọ ụkwụ nke Otu ahụ.[2]

Ọrụ Wikimedia

Wikimedia nwere usoro ihe ọmụma dị iche iche (dịka, Wikipedia, Wiktionary, Wikiversity, na ndị ọzọ). Ọrụ Wikimedia nke mpaghara ma ọ bụ nke onwe onye ọ bụla bụ ụdị nke asụsụ nke ọrụ ihe ọmụma (dịka Wikipedia Bekee, Wiktionary ndị Turkey). Ụfọdụ ọrụ Wikimedia bụ nke gafere udi asụsụ na enweghị ụdị asụsụ a kapịrị ọnụ (ọmụmatụ,Wikidata, Wikimedia Commons). Enwekwara ọrụ ndị na-arụ ọrụ dị ka akụrụngwa maka ngalaba otu Wikimedia, dị ka Meta wiki na MediaWiki wiki.

Ihe Ndetu

  1. Hụkwa nkọwaSubsidiarity & Self-ManagementSite the Usoro Ntuziaka atụmatụ otu a
  2. [$1 Della Porta & Diani (2006)] ghọtara na mmekọrịta ọha mmadụ nwere njirimara atọ: (a) nke bụ netwọk mmekọrịta a na-ahazighi ahazi n'etiti otutu ndi mmadu, otu, na/ma obu Ọgbakọ; (b) na-etinye aka na mgbanwe/esomokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ omenala; na (c) dị na ndabere nke njirimara jikọtara ọnụ. Otu a enweghị oke siri ike, ebe ọ bụ na otu dị iche iche na-ejikọ otu n'ime nke ọzọ.